Ezekiel 7

Ọgwụgwụ abịala

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ala Izrel:

“ ‘Ọgwụgwụ!
Ọgwụgwụ abịakwasịla akụkụ anọ nke ala ahụ.
3Ugbu a ka ọgwụgwụ bịakwasịrị unu.
Lee, aga m eme ka iwe m bịakwasị unu;
aga m ekpe unu ikpe dịka omume unu si dị,
aga m ata unu ahụhụ maka arụ unu niile.
4Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ,
agaghị m emekwara gị ebere,
kama aga m ata unu ahụhụ maka omume unu
na arụ niile dị nʼetiti unu.

“ ‘Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’

5“Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,

“ ‘Oke mbibi, oke mbibi nke a na-anụbeghị ụdị ya mbụ.
Lee, ka ọ na-abịa.
6Ọgwụgwụ abịala!
Ọgwụgwụ abịala!
Ọ kpalitela onwe ya imegide unu.
Lee, ka ọ na-abịa!
7Oke nsogbu abịakwasịla gị,
gị onwe gị bi nʼala ahụ.
Oge ahụ abịala! Ụbọchị ahụ dịkwa nso!
Ọgbaaghara dị ebe niile, ọ bụghị ọṅụ dị nʼelu ugwu niile.
8Ejikerela m ịwụkwasị gị ọnụma m nʼahụ
mee ka oke iwe m zuo gị ahụ niile.
Aga m ekpe gị ikpe dịka omume gị si dị,
kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ gị niile.
9Agaghị m emere gị ebere,
agakwaghị m ahapụ ịta gị ahụhụ.
Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị,
kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ niile nke dị nʼetiti unu.

“ ‘Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-eti unu ihe ndị a.

10“ ‘Lee, ụbọchị ahụ!
Lee, ka ọ na-abịa!
Oke nsogbu enupụtala,
mkpanaka agbala okoko
nganga amaala ifuru!
Ya bụ, na nganga na-abawanye

11Ihe ike ebilitala,
mkpọrọ eji ata ndị ajọ omume ahụhụ.
O nweghị onye ọbụla nʼime ha nke ga-afọdụ,
maọbụ igwe mmadụ
maọbụ ụba ha,
o nweghịkwa nke bara uru.
12Mgbe ahụ abịala!
Ụbọchị ahụ abịakwala nso.
Ka onye na-azụ ahịa ghara ịṅụrị ọṅụ
ka onye na-ere ere ghara iru ụjụ,
nʼihi na ọnụma ahụ dịrị igwe mmadụ niile.
13Onye rere ahịa agaghị enwetaghachi
ngwa ahịa nke erere ere
ọ bụladị dịka onye rere na onye zụrụ na-adị ndụ.
Nʼihi na ọhụ nke a gbasara igwe mmadụ niile
bụ nke a na-apụghị ịgbanwe.
Nʼihi mmehie ha niile, o nweghị onye nʼime ha
nke pụrụ ichebe ndụ ya.

14“ ‘Ha afụọla opi ike,
ha edoziela ihe niile
ma o nweghị onye ga-aga ibu agha
nʼihi na ọnụma m dịkwasịrị igwe mmadụ ahụ niile.
15Mma agha dị nʼezi;
ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime.
Onye nọ nʼọhịa
ga-anwụ site na mma agha,
ndị nọ nʼime obodo ukwu
ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa.
16Ma ndị gbapụrụ agbapụ
ga-agbaga nọrọ nʼugwu.
Ọ bụ dịka nduru nke ndagwurugwu,
ha niile ga-asụ ude akwa,
onye ọbụla nʼihi mmehie ha.
17Aka niile ga-akụda,
ikpere niile ka a ga-eji amịrị nyụdee.
18Ha ga-eyikwasị akwa mkpe,
oke ihe egwu ga-ekpuchi ha.
Ọ bụkwa ihu niile ka ihere ga-ekpuchi,
a ga-akpụchakwa isi niile.

19“ ‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile,
ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha.
Ọlaọcha na ọlaedo ha
agaghị enwe ike napụta ha
nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị.
Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha,
maọbụ mee ka afọ ju ha,
nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie.
20Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga,
ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche.
Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya;
ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ.
21Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha,
nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata
ndị ga-emerụ ya.
22Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m
ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa.
Ha ga-abata nʼime ya
merụọkwa ya.

23“ ‘Kwadoonụ ụdọ igwe.
Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara,
obodo ahụ jupụtara nʼihe ike.
24Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha
ka ha bịa nwetara onwe ha ụlọ ha niile.
Aga m eme ka mpako nke ndị bụ dike kwụsị,
meekwa ka ebe nsọ ha niile bụrụ ebe e merụrụ emerụ.
25Mgbe ihe mmekpa ahụ bịara,
ha ga-achọ udo ma o nweghị nke ga-adị.
26Mbibi ga-esochi mbibi,
akụkọ na-enweghị isi ga-esochikwa akụkọ na-enweghị isi.
Ha ga-agagharị na-achọ ọhụ site nʼaka onye amụma,
ntụziaka onye nchụaja ga-akwụsị,
ndụmọdụ nke ndị okenye agaghị adịkwa.
27Eze ga-eru ụjụ,
nwa eze ga-eyikwasị ịda mba nke obi dịka uwe,
aka ga-ama ndị ala ahụ niile jijiji nʼihi egwu.
Aga m emeso ha dịka omume ha si dị,
aga m ekpekwa ha ikpe dịka ihe ha kwenyeere si dị.

“ ‘Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

Copyright information for IboBIU